Abụ Ọma 67

Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Iscriviti alla nostra newsletter

Resta aggiornato su nuovi profili, eventi e novità della piattaforma.