Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?”Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha.Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.