Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchịHa na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.