Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. SelaObi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.