Abụ Ọma 54

O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Unseren Newsletter abonnieren

Bleiben Sie über neue Profile, Veranstaltungen und Plattform-Updates informiert.