Abụ Ọma 121

Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m? Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa. Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị; anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Unseren Newsletter abonnieren

Bleiben Sie über neue Profile, Veranstaltungen und Plattform-Updates informiert.