O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m.O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m.Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. SelaNʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.