Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. SelaOtu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. SelaBịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela