Abụ Ọma 12

Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ. O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha. Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi. Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?” “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.” Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa. O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Подписаться на нашу рассылку

Следите за новыми профилями, мероприятиями и обновлениями платформы.