A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.