Abụ Ọma 124

A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Subskrybuj nasz newsletter

Bądź na bieżąco z nowymi profilami, wydarzeniami i nowościami platformy.