Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike!Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.“Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”