O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.