Abụ Ọma 61

Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m. Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu. Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ. Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị. Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ. Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya. Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Misoratra ao amin'ny gazety anay

Mahafantara hatrany ny mombamomba vaovao, ny hetsika ary ny fanavaozana ny sehatra.