O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, nʼìhè nke ndụ.