Abụ Ọma 3

O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche. A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla. Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ. Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Misoratra ao amin'ny gazety anay

Mahafantara hatrany ny mombamomba vaovao, ny hetsika ary ny fanavaozana ny sehatra.