Mgbe ahụ, Job zara sị:“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi m megide unu.Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya m nʼime ntụ.Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.“Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.