Abụ Ọma 136

Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Na Ọg eze Bashan, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

S'abonner à notre newsletter

Restez informé des nouveaux profils, événements et mises à jour de la plateforme.