Abụ Ọma 137

Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara Zayọn. Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile. Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!” Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ? Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem, ka aka nri m chefuo ǹka ya. Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere Jerusalem, oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!” Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị, onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

订阅我们的新闻通讯

及时了解新的资料页、活动与平台更新。