Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu? Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ, na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ, ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị, izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi? Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka na-aghọta ya dịka ihe ubi.Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta. Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ, ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara, ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo, ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị, mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m, meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee. Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.Ọ kwụsịrị; ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ. Onyinyo guzooro nʼanya m, anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke? Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha: ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu, mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’