Job 25

Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe. Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị? Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha? Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya, ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”

Bible Nsọ (Igbo)

copyright © 2020 Biblica, Inc — CC-BY-SA-4.0 — CC-BY-SA-4.0

Abonneer op onze nieuwsbrief

Blijf op de hoogte van nieuwe profielen, evenementen en platformupdates.