Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.