O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.Ha na-asị, “ Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.