Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma.Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo.Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị, “Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa.Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ.Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ.Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụNdị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.