Elihu gara nʼihu sị:“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya; aga m enye Onye kere m ezi omume.Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha; onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya; ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị; ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.“E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.Mmadụ niile ahụzuola ya; ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị. Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.